UTME past questions
Igbo / 2011 / 14
UTME Objective

Ederede III
Ijeọma bitụrụ mma aka. Ọ bụghị
naanị nke a, ọ na-anụrụ ndị mụrụ ya
ihe
ma na-aga ozi nke ọma. Na Klaasị ha, o
nwere ndị enyi abụọ ntị fere azụ. Ha bụ
Ijeego na Ọbịaraeri. Ha ji ụkwụ ebi
okazi. Ha si n'otu obodo ha efere n'ọzọ
ebe ha na ụmụnwoke na-eri ma na-aṅụ.
Anya anaghị ahụ ha n'ụlọakwụkwọ n'ihi
na mgbe niile ha nọ na njem.
Ụmụagbọghọ ndị a amaghị na ihe
na-atọ ụtọ na-elukwa ilu. N'otu oge, ha
natara ozi n'ekwentị nke toro ha
nnukwu otito maka mma ha ma gwakwa
ha bịawa Warrị ebe mkpori ndụ juru.
Ndi kpọrọ ha bụ ụmụokorobịa abụọ ndị
na-aza Okondo na Otondo n'otu n'otu.
Ihe eji mara ha bu isogbhari
ụmụnwaanyi n'azu. Ijeego na enyi ya
nwaanyị binyeere ụmụnwoke ndị a
ịzuụka abụọ, n'agbanyeghị na ha bụ
ụmụakwụkwọ. Ka izu asaa gachara,
ụmụagbọghọ ndị a adaa ọrịa. Ka e
mechara nnyocha ọrịa ha n'ulọọgwụ, e
kwuru na ha na-arịa ọrịa mmịnwụ, ọrịa
obirinajaọcha a naghị agwọta agwọta.
Ugbua, eke na ihe o loro atogbọrọla.


Izu asaa n'Igbo bụ
A
otu ọnwa
B
onwa abụọ
C
ọnwa asaa
D
ọnwa iri.
Answer:A
Practice more with TestDriller

To see detailed solution to this question and thousands of other questions offline, download TestDriller UTME. Practice rigorously for UTME, learn from video and text materials, enjoy educational games, summary of JAMB literature books, compete with your peers, win prizes and more.

Get TestDriller