UTME past questions
Igbo / 2010 / 1
UTME Objective

AGHỌTAAZAA
Gụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.

Ederede I
Uche echefuola asị ọ tụọrọ nne na nna Ebuka na ya ga-enyere ha aka zụọ Ebuka
n'akwụkwọ.Ụmụ nke ya ga-anọ n'ụlọ, Ebuka ana-ejegharị ka atụrụ na-enweghị onye
nche, na-erere nne ya ukwu mmiri maọbụ ahụekere. Ezumike adịghịrị Ebuka. Ọ lọta
ahịa, okwu na ụka. Nne ya ukwu akụghị ya ihe na ọ nọtere aka, ọ maa ya akantị na Hausa
o rechaghị ihe o bunyere ya ree. Ọ bụzi nwamkpọta na-achụtara ezinaụlọ Uche ihe ha
na-eri? Ewo, Ụwa nwa ogbenye! Ọ bụrụ na aka dị nne na nna Ebuka arọ, ọ ga-anọ
n'ọnọdụ ọjọọ a?
Nke kachasị nke bụ orure a na-erezi ụmụaka n'oge a. Ndị ajọ mmadụ na-aga
kpọrọ ụmụaka nọ n'agbata afọ ise ruo n' iriabụọ n'ime obodo. Ha na-atụrụ nne na
nna ụmụntakịrị ndị a asị na ha ga-akpọga ha ebe ihe ga-adịrị ha mma ma zụọkwa ha
n'akwụkwọ.



Isiokwu kwesịrị ederede a bụ
A
Igbu ụmụaka
B
Mmegbu ụmụaka
C
Ịgba ụmụaka ohu
D
Ụmụaka anaghị eje akwụkwo.
Answer:B
Practice more with TestDriller

To see detailed solution to this question and thousands of other questions offline, download TestDriller UTME. Practice rigorously for UTME, learn from video and text materials, enjoy educational games, summary of JAMB literature books, compete with your peers, win prizes and more.

Get TestDriller